Psalms 144

Abụ Ọma nke Devid.

Abụ nke dike nʼagha

1Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,
onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,
na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.
2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,
ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,
onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.

3O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, a
gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?
4Mmadụ dị ka otu nkuume;
ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.

5O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata;
metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.
6Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile;
gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.
7Site nʼelu setịpụ aka gị;
gbapụta m, napụtakwa m
site nʼoke osimiri,
site nʼaka ndị si mba ọzọ,
8ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,
ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

9O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ.
Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;
10gị onye na-enye ndị eze mmeri,
onye na-agbapụta ohu ya Devid.

Site na mma agha dị njọ
11gbapụta m;
napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ
ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,
ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

12Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,
ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,
ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị
e ji achọ ụlọeze mma.
13Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri
dị iche iche si nʼubi anyị.
Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ,
ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;
14igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ.
A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile,
a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ,
akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.
15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị;
ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.
Copyright information for IboBIU